Psalms 132

Abụ nrigo.

Devid na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị

1O Onyenwe anyị, cheta Devid,
nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.

2Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị,
kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:
3“Agaghị m abanye nʼime ụlọ m
maọbụ rigoo nʼihe ndina m,
4agaghị m arahụ ụra,
egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,
5tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ
ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”

6Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata,
anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.
7“Ka anyị gaa na-ebe obibi ya;
ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
8‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị,
gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.
9Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe;
ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’ ”

10Nʼihi ohu gị, bụ Devid,
agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.

11 Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu,
bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ:
“Otu nʼime ụmụ gị,
ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,
12ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m
na ụkpụrụ niile m kuziri ha,
mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala
nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”

13Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn,
ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;
14“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi,
ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
15Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya;
aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.
16Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe,
ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.

17“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi
Nʼebe a mpi na-egosi ịdị ike
puputara Devid
ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.
18Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe
ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”
Copyright information for IboBIU